1. Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù:Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike.
2. Ka ayi were ekele bia n'iru Ya,Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.
3. N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu,Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.
4. Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya:Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.
5. Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.
6. Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:
7. N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi:Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya.Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,
8. Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba,Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:
9. Mb͕e nna-unu-hà nwaram,Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.
10. Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọb͕ọ ahu oyi,M'we si, Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu,Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile: