1. Ndi nātukwasi Jehova obiDika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.
2. Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu:Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu.Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
3. N'ihi na nkpa-n'aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n'elu ihe ruru ndi ezi omume n'ife-nzà;Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n'ajọ omume.
4. Jehova, me ndi di nma nma,Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma.