1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
2. Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a,Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u;
3. O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha,Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu,Site n'Ugwu na site n'oké osimiri.
4. Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara.
5. Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu,Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.
6. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.
7. O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi,Ijeru obodo obibi.
8. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
9. N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.
10. Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;
11. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:
12. O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu;Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.
13. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.
14. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.
15. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
16. N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.
17. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'alaSite n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.
18. Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.
19. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha na nkpà-ha nile.
20. O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.
21. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
22. Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.
23. Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;
24. Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.
25. N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.
26. Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.
27. Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè,Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.
28. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.
29. Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du,Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.
30. Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju;O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ.
31. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
32. Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya,Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.
33. O nēme ka osimiri ghọ ọzara,O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;
34. Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú,Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.
35. Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri,Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.
36. O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu,Ha we dozie obodo obibi;
37. Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche,Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.
38. Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku;Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.
39. Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala,Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.
40. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.
41. Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu,Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.
42. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.