1. Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke;Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi.
2. Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba,Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma.
3. Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di;Anughi olu-ha.
4. N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue,Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.
5. Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta,Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya.
6. Site n'otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di,Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile:Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya.
7. Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi:Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.
8. Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu:Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè.
9. Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù.
10. Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha:Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.
11. Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti:N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.
12. Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha?Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.
13. B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga;Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m'gēzu okè,Agāgukwam n'onye ikpe njehie riri nne nāmaghi.