1. Tonu Ja;N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma;N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.
2. Jehova nēwuli Jerausalem elu;Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.
3. Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu,Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.
4. Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando;Ha nile ka Ọ nākpọ aha.
5. Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne;Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.
6. Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ:Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.
7. Werenu ekele za Jehova,Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:
8. Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.
9. Ọ nēnye anumanu nri-ya,Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.
10. Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.
11. Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,Ndi nēchere ebere-Ya.
12. Gi Jerusalem, nāja Jehova;To Chineke-gi, Zaion.
13. N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.
14. Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.
15. Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.
16. Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.
17. Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?
18. Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.
19. Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.