1. Olum ka m'ji etiku Jehova;Olum ka m'ji ariọ Jehova aririọ-amara.
2. Anamekwuwa okwu ntamum n'iru Ya;Ahuhum ka m'nēgosi n'iru Ya.
3. Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm.N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.
4. Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam:Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.
5. Etikurum I, Jehova;Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm,Na òkèm n'ala ndi di ndu.
6. Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli:Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim.