1. Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú;Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2. Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya,Ihu ma ọ di onye nwere uche,Nke nāchọ Chineke.
3. Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri;Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.
4. Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?Bú ndi riworo nri site n'iri ndim,Ma ha akpọkughi Chineke.
5. N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh:N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi;I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha.