1. Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata,Ayi di ka ndi nārọ nrọ.
2. Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu,Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire:Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile,Jehova emeworo ndia ihe uku.
3. Jehova emeworo ayi ihe uku;Ayi nāṅuri ọṅu.
4. Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata,Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.
5. Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.