1. Bùkuenu Jehova abù ọhu;N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche;Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.
2. Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya:N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.
3. O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di:Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.
4. Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.
5. Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.
6. Chirinu opì na olu opì-ikeTisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.
7. Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya;Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;
8. Ka osimiri nile kua aka-ha;Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù;