isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66
  67. 67
  68. 68
  69. 69
  70. 70
  71. 71
  72. 72
  73. 73
  74. 74
  75. 75
  76. 76
  77. 77
  78. 78
  79. 79
  80. 80
  81. 81
  82. 82
  83. 83
  84. 84
  85. 85
  86. 86
  87. 87
  88. 88
  89. 89
  90. 90
  91. 91
  92. 92
  93. 93
  94. 94
  95. 95
  96. 96
  97. 97
  98. 98
  99. 99
  100. 100
  101. 101
  102. 102
  103. 103
  104. 104
  105. 105
  106. 106
  107. 107
  108. 108
  109. 109
  110. 110
  111. 111
  112. 112
  113. 113
  114. 114
  115. 115
  116. 116
  117. 117
  118. 118
  119. 119
  120. 120
  121. 121
  122. 122
  123. 123
  124. 124
  125. 125
  126. 126
  127. 127
  128. 128
  129. 129
  130. 130
  131. 131
  132. 132
  133. 133
  134. 134
  135. 135
  136. 136
  137. 137
  138. 138
  139. 139
  140. 140
  141. 141
  142. 142
  143. 143
  144. 144
  145. 145
  146. 146
  147. 147
  148. 148
  149. 149
  150. 150

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 77 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jeduthun si abù abù. Abù Ọma Esaf.

1. Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu;Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti.

2. N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ:Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi;Nkpuru-obim juru ka akasie ya.

3. M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku:M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah

4. I jidere ndi-nche nke anyam abua:Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu.

5. Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie,Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,

6. M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali:M'gēso obim tughari uche;Mọm we chọsie ike, si,

7. Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju?Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?

8. Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo?Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?

9. Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke?Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah

10. M'we si, Ọriam ka nka bu;Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.

11. M'gēhota omume nile nke Ja;N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.

12. M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile,Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.

13. Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di:Ònye bu chi uku dika Chineke?

14. Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu:I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.

15. I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi,Bú umu Jekob na Josef. Selah

16. Miri huru Gi, Chineke;Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u:Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.

17. Igwe-oji nile wupuru miri;Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà:Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.

18. Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu;Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.

19. N'oké osimiri ka uzọ-Gi di,Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri,Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.