1. Jehova, Onye-nwe-ayi,Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé.
2. I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike,N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi,Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.
3. Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;
4. Gini ka madu bu, na I nēcheta ya;Na nwa nke madu, na I nēleta ya?
5. I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke,I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze.
6. I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua;Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:
7. Ewu na aturu na ehi, ha nile,Ha na anu ọhia;
8. Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri,Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile.