1. N'akuku osimiri nile nke Babilon,N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá,Mb͕e ayi chetara Zaion.
2. N'osisi willow di n'etiti yaKa ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi.
3. N'ihi na n'ebe ahu ka ndi nādọta ayi n'agha riọro n'aka-ayi okwu abù,Ndi lutara ihe-ayi n'agha riọ-kwa-ra ayi ka ayi ṅuria ọṅu, si,Bùaranu ayi otù nime abù Zaion.
4. Àyi gēsi aṅa bù abù JehovaN'ala nke onye ala ọzọ?
5. Ọ buru na echezọm i, Jerusalem,Ka aka-nrim chezọ ǹkà-ya.
6. Ka irem rapara n'okpo-ọnum,Ma ọ buru na adighm-echeta gi;Ma ọ buru na adighm-eme ka Jerusalem di eluN'elu isi ọṅùm.
7. Jehova, cheta ubọchi JerusalemMegide umu Edom;Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ,Rue ntọ-ala di nime ya.
8. Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe;Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi giNmeso-gi nke i mesoworo ayi.