1. Onye amaworo na Juda ka Chineke bu:N'Israel ka aha-Ya di uku.
2. Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.
3. N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta;Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah
4. Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.
5. Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha;Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.
6. Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob,Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.
7. Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu:Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?
8. I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé;Uwa turu egwu, we di jū,
9. Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe,Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa. Selah
10. N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi:I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.
11. Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu:Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.