1. Tonu Ja.Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova.Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.
2. Ndi-dike ka nkpuru-ya gābu n'uwa:Agāgọzi ọb͕ọ ndi ziri ezi.
3. Ihe di iche iche di oké ọnu-ahia na àkù di n'ulo-ya:Ezi omume-ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
4. Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi:Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.
5. Ọ diri nwoke ahu nma, bú onye nēme-ebere, nēbinye kwa madu ihe;Ọ gākwagide okwu-ya nile n'ikpé.
6. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya:Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.
7. Ọ gaghi-esite n'ihe ọjọ anuworo tu egwu:Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi Jehova obi.
8. Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu,Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.
9. Ọ ghasawo àkù-ya, o nyewo ndi-ob͕eye ihe;Ezi omume-ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:Agēwere nsọpuru me ka mpi-ya di elu.