1. Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānuOlum, bú aririọ-amaram nile.
2. N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ,Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya.
3. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram:Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu.
4. M'we kpọkue aha Jehova;Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya.
5. Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu;E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.
6. Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu:Enweghm ike, O we nyem nzọputa.
7. Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi;N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.
8. N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu,I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri,I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.
9. M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu.
10. Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu:Ewedara mu onwem n'ala nke-uku:
11. Mu onwem siri na nkujamMadu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha.
12. M'gēsi aṅa nyeghachi JehovaNmeso ọma Ya nile O mesoworom?
13. Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli,Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.
14. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.
15. Ihe di oké ọnu-ahia n'anya JehovaKa ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.
16. Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi:Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi;I tọpuwo ab͕um nile.
17. Gi ka m'gāchuru aja ekele,Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.
18. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile;