1. Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n'anya nke-uku,Jehova nke usu nile nke ndi-agha!
2. Agu agusiwo nkpuru-obim ike, e, ọ gwusiwo kwa n'ichọ ogige nile nke Jehova;Obim na anu-arum nētiku Chineke di ndu nkpu ọṅù.
3. Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo,Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-yaBú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha,Ezem na Chinekem.
4. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n'ulo-Gi bu:Ha gānọ nēto Gi. Selah
5. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi;Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi.
6. Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche;Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya.
7. Ha nēsi n'ike jerue ike,Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion.
8. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem:Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah
9. Le ọta-ayi, Chineke,Legide kwa iru onye-Gi etere manu.
10. N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ.Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem,Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.
11. N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu:Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye:Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ.