1. Tonu Ja.Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya:Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya.
2. Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile:Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di.
3. Werenu ọfufù opì-ike to Ya:Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.
4. Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya:Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:
5. Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya:Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya.
6. Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja.Tonu Ja.