1. Edoziwo obim, Chineke;M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù.
2. Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ.
3. M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova:M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile.
4. N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe,Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.
5. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke:Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile.
6. Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.
7. Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha:M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.
8. Mu nwe Gilead; mu nwe Manase;Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;Juda bu nkpa-n'aka-ezem.
9. Moab bu ite ọsisa-arum;N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu.
10. Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?Ònye duruworom rue Edom?
11. Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju?I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke.
12. Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u:N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.