1. Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di.Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú;Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2. Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya,Ihu ma ọ di onye nwere uche,Nke nāchọ Chineke.
3. Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri;Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.
4. Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe?Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m,Ma ha akpọkughi Jehova.
5. N'ebe ahu ka ha turu oké egwu;N'hi na Chineke nọ n'ọb͕ọ onye ezi omume.
6. Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere,N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya.