isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66
  67. 67
  68. 68
  69. 69
  70. 70
  71. 71
  72. 72
  73. 73
  74. 74
  75. 75
  76. 76
  77. 77
  78. 78
  79. 79
  80. 80
  81. 81
  82. 82
  83. 83
  84. 84
  85. 85
  86. 86
  87. 87
  88. 88
  89. 89
  90. 90
  91. 91
  92. 92
  93. 93
  94. 94
  95. 95
  96. 96
  97. 97
  98. 98
  99. 99
  100. 100
  101. 101
  102. 102
  103. 103
  104. 104
  105. 105
  106. 106
  107. 107
  108. 108
  109. 109
  110. 110
  111. 111
  112. 112
  113. 113
  114. 114
  115. 115
  116. 116
  117. 117
  118. 118
  119. 119
  120. 120
  121. 121
  122. 122
  123. 123
  124. 124
  125. 125
  126. 126
  127. 127
  128. 128
  129. 129
  130. 130
  131. 131
  132. 132
  133. 133
  134. 134
  135. 135
  136. 136
  137. 137
  138. 138
  139. 139
  140. 140
  141. 141
  142. 142
  143. 143
  144. 144
  145. 145
  146. 146
  147. 147
  148. 148
  149. 149
  150. 150

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 37 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke Devid.

1. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ,Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.

2. N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.

3. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.

4. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

5. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

6. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.

7. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.

8. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.

9. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

10. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.

11. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.

12. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.

13. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia

14. Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:

15. Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,Agāb͕aji kwa uta-ha.

16. Ihe ntà onye ezi omume nwere di nmaKari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.

17. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.

18. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.

19. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.

20. N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.

21. Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.

22. N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.

23. Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.

24. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.

25. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.

26. Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.

27. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

28. N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.

29. Ndi ezi omume gēnweta ala,Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.

30. Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.

31. Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.

32. Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.

33. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.

34. Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.

35. Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.

36. O we gabiga, ma, le, ọ nọgh:M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.

37. Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi:N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.

38. Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù:Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu.

39. Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia:Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.