1. Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion:Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere.
2. Gi Onye nānu ekpere,Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.
3. Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike:Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.
4. Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa,Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso,Ka o we biri n'ogige-Gi nile:Ka afọ ju ayi n'ezi ihe nke ulo-Gi,Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi.
5. Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume,Chineke nke nzọputa-ayi;Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa,Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya:
6. Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike;Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:
7. Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha,Ya na ùzù nke mba nile.
8. Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi:I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.
9. I letawo ala, we me ka o juputa n'ihe,I nēme ka ọ nwe àkù ri nne;Miri-iyi Chineke juputara na miriI nēdozi ọka-ha, mb͕e I si otú a dozie ala onwe-ya.
10. I nēdè ọ̀b͕à-ala-ubi-ya miri:I nēme ka ebe elu ya nile di lari:I nēji oké miri-ozuzo b͕aze ya;I nāgọzi ihe-opupú-ya.
11. I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze;Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba.
12. Ha nātasa n'ebe-ita-nri niile nke ọzara:Anēji kwa otite-egwú-ọṅù ke ugwu ntà nile n'úkwù.