1. Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ:Ṅa nti olum, mb͕e m'kpọkuru Gi.
2. Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Gi;Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.
3. Jehova, Do nche n'iru ọnum;Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua.
4. Ewezugala obim ime ihe ọjọ,Iji nmebi-iwu nēme omume,Mu na madu ndi nālu ajọ ihe:Ekwe-kwa-la ka m'rie ihe ọ bula nihe-utọ n'ile ha.
5. Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere;Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi;Ekwela ka isim si, É-è:N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.
6. Atudawo ndi-ikpe-ha n'akuku nkume di elu;Ha gānu kwa okwu-ọnum nile; n'ihi na ha di utọ.
7. Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala,Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n'ọnu ala-mọ.
8. N'ihi na ọ bu n'ebe I nọ, Jehova, Onye-nwe-ayi, ka anyam abua di:Nime Gi ka m'b͕abàworo; ab͕apula nkpuru-obim dika miri.
9. Debem ka m'ghara idabà n'ib͕udu ha sirim,Na n'ọnyà ndi nālu ajọ ihe.