1. Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ:I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.
2. I bupuwo ajọ omume ndi-Gi,I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah
3. I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi:I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.
4. Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi,Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.
5. Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe?Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?
6. Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ:Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?
7. Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,Nye kwa ayi nzọputa-Gi.
8. M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu:N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo:Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.
9. Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya;Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.
10. Ebere na ezi-okwu ezutewo;Ezi omume na udo esutuwo ọnu.
11. Ezi-okwu nēpú epú n'ala;Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya.
12. Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe;Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.