1. Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo,We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
2. Site na Zaion, bú ebe mazuru nma,Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.
3. Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti:Ọku nēripia n'iru Ya,Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
4. Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù,Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe:
5. Chikọtaranum ndi-eberem;Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.
6. Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya;N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah
7. Nuru, ndim, M'gēkwu kwa;Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi:Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu.
8. Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba;Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
9. M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi,M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.
10. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.
11. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.
12. Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.
13. M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?
14. Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:
15. Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
16. Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?
17. Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,We tufue okwum nile n'azu gi.
18. Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.
19. I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ,Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.
20. I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.
21. Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti;I chère na adizum ka i di:M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.
22. Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke,Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu: