isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66
  67. 67
  68. 68
  69. 69
  70. 70
  71. 71
  72. 72
  73. 73
  74. 74
  75. 75
  76. 76
  77. 77
  78. 78
  79. 79
  80. 80
  81. 81
  82. 82
  83. 83
  84. 84
  85. 85
  86. 86
  87. 87
  88. 88
  89. 89
  90. 90
  91. 91
  92. 92
  93. 93
  94. 94
  95. 95
  96. 96
  97. 97
  98. 98
  99. 99
  100. 100
  101. 101
  102. 102
  103. 103
  104. 104
  105. 105
  106. 106
  107. 107
  108. 108
  109. 109
  110. 110
  111. 111
  112. 112
  113. 113
  114. 114
  115. 115
  116. 116
  117. 117
  118. 118
  119. 119
  120. 120
  121. 121
  122. 122
  123. 123
  124. 124
  125. 125
  126. 126
  127. 127
  128. 128
  129. 129
  130. 130
  131. 131
  132. 132
  133. 133
  134. 134
  135. 135
  136. 136
  137. 137
  138. 138
  139. 139
  140. 140
  141. 141
  142. 142
  143. 143
  144. 144
  145. 145
  146. 146
  147. 147
  148. 148
  149. 149
  150. 150

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 35 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke Devid.

1. Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù:Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.

2. Jide ọta na ọta uku,Bilie iyerem aka.

3. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.

4. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.

5. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.

6. Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.

7. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.

8. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.

9. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.

10. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.

11. Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.

12. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.

13. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;Ekperem nālaghachikute kwa obim.

14. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.

15. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi;Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:

16. Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha,Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.

17. Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.

18. M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba:N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.

19. Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu:Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.

20. N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.

21. Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem;Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.

22. I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti:Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.

23. Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m,Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.

24. Kpem ikpe dika ezi omume-Gi si di, Jehova, bú Chinekem;Ekwe-kwa-la ka ha ǹuam ọǹu.

25. Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi:Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.

26. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim:Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.

27. Ka ha tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa ọṅu, bú ndi ezi omumem nātọ utọ:Ka ha nāsi kwa mb͕e nile, Jehova di uku, Onye udo orù-Ya nātọ Ya utọ.