isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66
  67. 67
  68. 68
  69. 69
  70. 70
  71. 71
  72. 72
  73. 73
  74. 74
  75. 75
  76. 76
  77. 77
  78. 78
  79. 79
  80. 80
  81. 81
  82. 82
  83. 83
  84. 84
  85. 85
  86. 86
  87. 87
  88. 88
  89. 89
  90. 90
  91. 91
  92. 92
  93. 93
  94. 94
  95. 95
  96. 96
  97. 97
  98. 98
  99. 99
  100. 100
  101. 101
  102. 102
  103. 103
  104. 104
  105. 105
  106. 106
  107. 107
  108. 108
  109. 109
  110. 110
  111. 111
  112. 112
  113. 113
  114. 114
  115. 115
  116. 116
  117. 117
  118. 118
  119. 119
  120. 120
  121. 121
  122. 122
  123. 123
  124. 124
  125. 125
  126. 126
  127. 127
  128. 128
  129. 129
  130. 130
  131. 131
  132. 132
  133. 133
  134. 134
  135. 135
  136. 136
  137. 137
  138. 138
  139. 139
  140. 140
  141. 141
  142. 142
  143. 143
  144. 144
  145. 145
  146. 146
  147. 147
  148. 148
  149. 149
  150. 150

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 69 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim. Abù Ọma nke Devid.

1. Zọputam, Chineke;N'ihi na miri abiaruwo nkpuru-obim.

2. Emikpuwom n'urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di:Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m.

3. Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku:Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.

4. Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu:Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha:Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike.

5. Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ;Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile.

6. Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha:Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel.

7. N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta;Ihere ekpuchiwo irum.

8. Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.

9. N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom;Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.

10. M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim,O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.

11. Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem,M'we ghọrọ ha ilu.

12. Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem;Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.

13. Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi,Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.

14. Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe.Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi.

15. Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum,Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam;Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya.

16. Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma:Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.

17. Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.

18. Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:N'ihi ndi-irom b͕aputam.

19. Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.

20. Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike:M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula;M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.

21. Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.

22. Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.

23. Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.

24. Wukwasi ha iwe-Gi,Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru.

25. Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu;Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha.

26. N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo;Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.

27. Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha:Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi.

28. Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu,Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.

29. Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u:Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.

30. M'gēji abù to aha Chineke,M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku.

31. Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi,Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa.

32. Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri:Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu.

33. N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye,Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya.

34. Ka elu-igwe na ala to Ya,Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha.

35. N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda;Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya.