1. Jehova za gi n'ubọchi nkpà,Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu;
2. Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi,Si kwa na Zaion kwagide gi;
3. Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma,Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah
4. Ya nye gi dika obi-gi si acho,Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile.
5. Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi,Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu:Jehova mezue aririọ-gi nile.
6. Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu;O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-YaZa ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.
7. Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya:Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.
8. Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada:Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.