1. Mb͕e Israel siri n'Ijipt puta,Mb͕e ulo Jekob siri na ndi nātatọ okwu puta;
2. Juda ghọro ebe nsọ Ya,Israel ghọrọ ala Ọ nāchi.
3. Oké osimiri huru ya, we b͕alaga;Jọdan chighariri la azu.
4. Ugwu nile wuliri elu dika ebulu,Ugwu ntà nile wuliri elu dika umu-aturu.
5. Gini nēme gi, oké osimiri, na i nāb͕a ọsọ?Gini nēme gi, Jọdan, na i nēchighari la azu?
6. Gini nēme unu, ugwu, na unu nāwuli elu dika ebulu?Gini nēme unu, ugwu ntà, na unu nāwuli elu dika umu-aturu?
7. Ka o b͕ue gi nb͕u, gi uwa, site n'iru Onye-nwe-ayi,Site n'iru Chineke nke Jekob;