isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66
  67. 67
  68. 68
  69. 69
  70. 70
  71. 71
  72. 72
  73. 73
  74. 74
  75. 75
  76. 76
  77. 77
  78. 78
  79. 79
  80. 80
  81. 81
  82. 82
  83. 83
  84. 84
  85. 85
  86. 86
  87. 87
  88. 88
  89. 89
  90. 90
  91. 91
  92. 92
  93. 93
  94. 94
  95. 95
  96. 96
  97. 97
  98. 98
  99. 99
  100. 100
  101. 101
  102. 102
  103. 103
  104. 104
  105. 105
  106. 106
  107. 107
  108. 108
  109. 109
  110. 110
  111. 111
  112. 112
  113. 113
  114. 114
  115. 115
  116. 116
  117. 117
  118. 118
  119. 119
  120. 120
  121. 121
  122. 122
  123. 123
  124. 124
  125. 125
  126. 126
  127. 127
  128. 128
  129. 129
  130. 130
  131. 131
  132. 132
  133. 133
  134. 134
  135. 135
  136. 136
  137. 137
  138. 138
  139. 139
  140. 140
  141. 141
  142. 142
  143. 143
  144. 144
  145. 145
  146. 146
  147. 147
  148. 148
  149. 149
  150. 150

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 25 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma nke Devid.

1. Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim.

2. Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi,Ekwela ka ihere mem;Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.

3. Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha:Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu.

4. Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile;Zím okporo-uzọ-Gi nile.

5. Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe;N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam;Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile.

6. Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile;N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo.

7. Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile:Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.

8. Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ.

9. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé:Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.

10. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwuN'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.

11. N'ihi aha-Gi, Jehova,B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.

12. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa.

13. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.

14. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.

15. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.

16. Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.

17. Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.

18. Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.

19. Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu;Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.

20. Debe nkpuru-obim, naputakwam:Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.

21. Ka izu-okè na izi-ezi chezim,N'ihi na elewom anya Gi.