1. Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova,Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.
2. Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa:Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.
3. Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu,Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?
4. Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.
5. Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.
6. Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.
7. Ha we si, Ja agaghi-ahu,Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.
8. Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel:Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?
9. Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?
10. Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?
11. Jehova mara èchìchè madu,Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.
12. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;
13. Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ,Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.
14. N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka,Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.
15. N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume:Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.
16. Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ?Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?
17. Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka,Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū.
18. Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya;Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.
19. Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem,Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.
20. Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile,Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?
21. Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume,Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.
22. Ma Jehova aburuworom ulo-elu;Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.