isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66
  67. 67
  68. 68
  69. 69
  70. 70
  71. 71
  72. 72
  73. 73
  74. 74
  75. 75
  76. 76
  77. 77
  78. 78
  79. 79
  80. 80
  81. 81
  82. 82
  83. 83
  84. 84
  85. 85
  86. 86
  87. 87
  88. 88
  89. 89
  90. 90
  91. 91
  92. 92
  93. 93
  94. 94
  95. 95
  96. 96
  97. 97
  98. 98
  99. 99
  100. 100
  101. 101
  102. 102
  103. 103
  104. 104
  105. 105
  106. 106
  107. 107
  108. 108
  109. 109
  110. 110
  111. 111
  112. 112
  113. 113
  114. 114
  115. 115
  116. 116
  117. 117
  118. 118
  119. 119
  120. 120
  121. 121
  122. 122
  123. 123
  124. 124
  125. 125
  126. 126
  127. 127
  128. 128
  129. 129
  130. 130
  131. 131
  132. 132
  133. 133
  134. 134
  135. 135
  136. 136
  137. 137
  138. 138
  139. 139
  140. 140
  141. 141
  142. 142
  143. 143
  144. 144
  145. 145
  146. 146
  147. 147
  148. 148
  149. 149
  150. 150

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 79 Bible Nso (IGBOB)

Abù Ọma Esaf.

1. Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi;Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ;Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.

2. Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.

3. Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.

4. Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.

5. Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?

6. Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7. N'ihi na ha eripiawo Jekob,Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

8. Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

9. Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.

10. N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi,Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.

11. Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi;Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;

12. Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa,Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.