1. Jehova, Abalaram nba n'iwe-Gi,Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2. Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu:Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.
3. Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku:Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?
4. Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim:Zọputam n'ihi ebere-Gi.
5. N'ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n'ọnwu:Nime ala-mọ ònye gēkele Gi?
6. Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem;Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim;Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.
7. Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri;Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile.
8. Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe;N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám.
9. Jehova anuwo arirọ-amaram;Jehova gānara ekperem.