1. M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu,I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.
2. Jehova, bú Chinekem,Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu.
3. Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa:I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu.
4. Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya,Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.
5. N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya;Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ:N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali,Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.
6. Ma mu onwem, asirim n'udom,Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi.
7. Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m:I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji.
8. Gi, Jehova, ka m'nākpọku;Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara:
9. Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù?Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi?
10. Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara:Jehova, buru onye nēyerem aka.
11. I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú;I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké: