1. Mb͕e m'kpọrọ, Gi zam, Chineke nke ezi omumem;I nyewom ebe sara mbara mb͕e m'nọ na nkpà:Merem amara, nuru ekperem.
2. Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n'ọnọdu-ihere?Unu nāhu ihe-efu n'anya, nāchọ okwu-ugha.
3. Ma maranu na Jehova ekewaputaworo Onwe-ya onye-ebere:Jehova nānu mb͕e m'kpọkuru Ya.
4. Manu jijiji, emehie-kwa-la:Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah
5. Chuanu àjà ezi omume,Tukwasi-kwa-nu obi na Jehova.
6. Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma?Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.
7. I tiyewo ọṅù n'obim,Kari nke ha nwere na mb͕e ọka-ha na manya-vine ọhu ha ji aba uba.