1. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu,Ndi nējeghari n'iwu jehova.
2. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu,Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya.
3. E, ha emeghi ajọ omume;N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije.
4. Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu,Ka ayi we debesie ha ike.
5. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nileIdebe ukpuru-Gi nile!
6. Mb͕e ahu ihere agaghi-emem,Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di.
7. M'gēwere obi ziri ezi kele Gi,Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi.
8. Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe:Arapusilam arapu.
9. Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha?Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.
10. Obim nile ka m'wereworo chọ Gi:Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
11. N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi,Ka m'we ghara imehie megide Gi.
12. Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova:Zím ukpuru-Gi nile.
13. Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọIkpé nile nke ọnu-Gi.
14. N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ,Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile.
15. N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche,M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya.
16. Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku:M'gaghi-echezọ okwu-Gi.
17. Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu;M'gēdebe kwa okwu-Gi.
18. Kpughepu anyam abua, ka m'we legideOké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.
19. Ọbìa ka m'bu n'uwa:Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu.
20. Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọO ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile.
21. I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike,Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.
22. Wepu ita-uta na nleda n'arum;N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile.
23. Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem:Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile.
24. Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku,Ha bu ndi nādum ọdu.
25. Nkpuru-obim nārapara n'ájá:Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu.
26. Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam:Gi zím ukpuru-Gi nile.
27. Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile:M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile.
28. Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú:Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike.
29. Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ:Were kwa amara nyem iwu-Gi.
30. Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo:Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum.
31. Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile:Jehova, emela ka ihere mem.
32. N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ,N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.
33. Jehova, zím uzọ ukpuru-Gi nile:M'gēchebe kwa ya rue mb͕e ikpe-azu.
34. Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi;M'gēwere kwa obim nile debe ya.
35. Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu;N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ
36. Wezuga obim iche ihe-àmà-Gi nile iru,Ewezuga-kwa-la ya iche urù nēzighi ezi iru.
37. Me ka anyam abua si n'ile ihe-efu gabiga,Me ka m'di ndu n'uzọ-Gi nile.
38. Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike,Bú nke diri egwu-Gi.
39. Me ka ita-utam nke m'nātu ujọ ya gabiga;N'ihi na ikpé-Gi nile di nma.
40. Le, achọsiwom ihe-iriba-ama-Gi nile ike:N'ezi omume-Gi me ka m'di ndu.
41. Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova,Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di.
42. M'gāza kwa onye nātam uta okwu;N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi.
43. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum;N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo.
44. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nileRue mb͕e nile ebighi-ebi.
45. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
46. M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze,Ihere agaghi-emekwam.
47. Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku,Bú nke m'huworo n'anya.
48. M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya;M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile.
49. Cheta okwu I gwara orù-Gi,Nke I meworom ka m'chere.
50. Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam:Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu.
51. Ndi-nganga akwawom emò nke-uku:Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem.
52. Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova,We kasie onwem obi.
53. Iwe di ọku ejidewom,N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi.
54. Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworomN'ulo ebe m'nọ dika ọbìa.
55. Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali,We debe iwu-Gi.
56. Nka ka m'nweworo,Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile.
57. Òkèm ka Jehova bu:Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile.
58. Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua:Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di.
59. Echèrem èchìchè uzọm nile,We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile.
60. Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya,Idebe ihe nile I nyere n'iwu.
61. Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu;Ma echezọghm iwu-Gi.
62. N'etiti abali ka m'gēbili ikele GiN'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi.
63. Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu,Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù.
64. Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi:Zím ukpuru-Gi nile.
65. I meworo orù-Gi ezi ihe,Jehova, dika okwu-Gi si di.
66. Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma;N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo.
67. Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama;Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo.
68. Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma;Zím ukpuru-Gi nile.
69. Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu:Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile.
70. Obi-ha bu nání abuba dika abuba;Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.
71. Ọ dim nma na ewedawom n'ala;Ka m'we muta ukpuru-Gi nile.
72. Iwu ọnu-Gi dim nmaKari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.
73. Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike:Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.
74. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria;N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo.
75. Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume,Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala.
76. Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim,Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di.
77. Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu;N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku.
78. Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ:Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile.
79. Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem,Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile.
80. Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile,Ka ihere we ghara imem.
81. Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike:Ma okwu-Gi ka m'chereworo.
82. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike,Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?
83. N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku;Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.
84. Ùbọchi nke orù-Gi di ole?Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe?
85. Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche,Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.
86. Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi:N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka.
87. Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa;Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.
88. Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu,M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi.
89. Jehova, rue mb͕e ebighi-ebiKa emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe.
90. Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di:I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo.
91. Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta;N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi.
92. Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku,Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.
93. Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile:N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu.
94. Ọ bu Gi nwem, zọputam;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
95. Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì;Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche.
96. Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile;Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.
97. Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya!Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.
98. Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom;N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim.
99. Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche;N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.
100. Anamaghọta ihe kari ndi-okenye,N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo.
101. Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula,Ka m'we debe okwu-Gi.
102. Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem;N'ihi na I zíwom ihe.
103. Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ!Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
104. M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe:N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.
105. Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum,Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm.
106. Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike,Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi.
107. Ewedawom n'ala nke-uku:Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di.
108. Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova,Zíkwam ikpé-Gi nile.
109. Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile;Ma echezọghm iwu-Gi.
110. Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya;Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia.
111. Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi;N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.
112. Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile,Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.
113. Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì:Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
114. Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu:Okwu-Gi ka m'chereworo.
115. Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ;Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu.
116. Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu;Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem.
117. Kwaliem elu, ewe zọputam,M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile.
118. I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.
119. I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.
120. Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.
121. Emewom ikpe ekpere na ezi omume:Arapulam nye ndi nēmeb͕um.
122. Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma:Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem.
123. Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike,Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.
124. Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di,Zíkwam ukpuru-Gi nile
125. Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe,Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.
126. Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu;Ha emebiwo iwu-Gi.
127. N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anyaKari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha.
128. N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi;Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.
129. Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu:N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha.
130. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè;Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.
131. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike;N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.
132. Chem iru, me-kwa-ram amara,Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.
133. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi:Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.
134. B͕aputam na nmeb͕u nke madu:M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
135. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;Zíkwam ukpuru-Gi nile.
136. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
137. Onye ezi omume ka I bu Jehova,Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
138. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omumeNa ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
139. Ekworom ekpochapuwom,N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
140. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.
141. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya:Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.
142. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi,Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu
143. Ahuhu na nkpà achọtawom:Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.
144. Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi:Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.
145. Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova:Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe.
146. Akpọkuwom I; zọputam,M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile.
147. Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi:Okwu-Gi nile ka m'chere.
148. Anyam abua buru nche-abali nile uzọ,Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi.
149. Nuru olum, dika ebere-Gi si di:Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu.
150. Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ;Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya.
151. Gi onwe-gi nọ nso, Jehova;Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu.
152. Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile,Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha.
153. Hu nweda-n'alam, dọputam;N'ihi na echezọghm iwu-Gi.
154. Kpe ọnum b͕aputakwam:Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu.
155. Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ;N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile.
156. Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova;Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu.
157. Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um;Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem.
158. Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi;N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.
159. Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya:Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu.
160. Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu;Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.
161. Ndi-isi esob͕uwom n'efu;Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha.
162. Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi,Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata.
163. Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú;Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
164. Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi,N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi.
165. Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere;Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.
166. Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova,Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo.
167. Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile;Anamahu kwa ha n'anya nke-uku.
168. Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile;N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi.
169. Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova:Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe.
170. Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi:Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam.
171. Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto;N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile.
172. Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi;N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume.
173. Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka;N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo.
174. Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova;Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku.
175. Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi;Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.