1. Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume:N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.
2. Werenu ubọ-akwara kele Jehova:Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.
3. Bùkueune Ya abù ọhu;Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma.
4. N'ihi na okwu Jehova ziri ezi;Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi.
5. Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya:Uwa juputara n'ebere jehova.
6. Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe;Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.
7. Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe:Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.
8. Ka uwa nile tua egwu Jehova:Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya.
9. N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di;Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.
10. Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile:Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.
11. Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi,Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.
12. Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya;Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.
13. Jehova siri n'elu-igwe legide anya;Ọ huwo umu madu nile;
14. Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-YaLekwasi ndi nile bi n'uwa anya;
15. Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù,Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile.
16. Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa:Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.
17. Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu:Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.
18. Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya,Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;
19. Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu,Na idebe ha ndu n'oké unwu.
20. Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova:Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu.
21. N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu,N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi.