1. Chineke, nye eze ikpé-Gi nile,Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.
2. O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe,O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.
3. Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo,Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.
4. Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe,Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa,Zọpia kwa onye-nmeb͕u.
5. Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide,Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.
6. Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu:Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.
7. Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu;Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.
8. Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.
9. Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya;Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.
10. Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.
11. E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:Mba nile gēfè ya òfùfè.
12. N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.
13. Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.
14. Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha;Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.
15. Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba:Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile;Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.
16. Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile;Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.
17. Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi;N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù:Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya:Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.
18. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel,Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:
19. Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi;Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya.Amen, na Amen.