1. M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze;M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
2. Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi;M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
3. Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku;Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.
4. Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ,We gosi idi-ike-Gi nile.
5. N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi,Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.
6. Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa;Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya.
7. Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa,Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.
8. Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.
9. Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di;Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.
10. Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova;Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.
11. Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa,Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;
12. Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile,Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.
13. Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi,Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.
14. Jehova nākwagide ndi nile nāda ada,O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala.
15. Anya ihe nile nēle anya Gi;Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
16. I nāsaghe aka-Gi,I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.
17. Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile,Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile.
18. Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya,Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu.
19. Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme;Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.
20. Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya;Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.