1. Chineke, were aha-Gi zọputam,Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.
2. Chineke, nuru ekperem;Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum.
3. N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem,Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim:Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah
4. Le, Chineke bu onye nēyerem aka:Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim.
5. Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha:Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.
6. M'gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà:M'gēkele aha-Gi, Jehova, n'ihi na ọ di nma.