1. Dika agu iyi miri si agu nne-ele,Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke.
2. Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku:Òle mb͕e m'gābia, ewe hum n'iru Chineke?
3. Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali,Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?
4. Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri,Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke,N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe.
5. Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim?Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọN'ihi nzọputa nile nke iru-Ya.
6. Chinekem, nimem ka nkpuru-obim nēruda n'ala:N'ihi ya anamecheta Gi site n'ala Jọdan,Site kwa na Heamon, site n'ugwu Miza.
7. Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi:Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim.
8. N'ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu,N'abali kwa ka abù-Ya gādi n'onum,Bú ekpere m'nēkpere Chineke nke ndum.
9. Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom?N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?
10. Dika asi na eji ihe gwepia ọkpukpum nile, ndi nākpab͕um nātam uta;Mb͕e ha nāsin ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?