1. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu,Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù:Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:
2. Eberem, na ebem ewusiri ike,Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu;Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya;Onye nāzọda ndim n'okpurum.
3. Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?
4. Madu yiri otù nku-umeUbọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.
5. Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.
6. Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.
7. Si n'elu setipu aka-Gi;Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri,N'aka ndi ala ọzọ;
8. Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.
9. Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi:Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma.
10. Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa:Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.
11. Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ,Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.
12. Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata;Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;
13. Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche;Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi;
14. Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma;Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di,Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi;