1. Ọ buru na Jehova ewughi ulo,N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya:Ọ buru na Jehova echeghi obodo,N'efu ka onye-nche muruworo anya.
2. Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala,Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche:Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.
3. Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu:Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.
4. Dika àkú n'aka dike,Otú a ka umu amuru na mb͕e okorọbia di.