isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 6 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma,Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!

3. N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile:N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.

4. N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem,Nke ńsí-ha ka mọm nāṅuIhe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.

5. Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu?Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?

6. Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya?Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?

7. Ihe nkpuru-obim nāju imetu,Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.

8. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia;Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!

9. Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam;Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.

10. Nkasi-obim we nādiru ub͕u a;M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko:N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.

11. Gini bu ikem na m'gēche?Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?

12. Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu?Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?

13. Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem?Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?

14. Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya;Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.

15. Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi,Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;

16. Nke nēji nji n'ihi ice,Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:

17. Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu:Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.

18. Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha;Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.

19. Ndi-ije nke Tima legidere anya,Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.

20. Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi;Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.

21. N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe;Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.

22. Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe?Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?

23. Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u?Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?

24. Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti:Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.

25. Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè!Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?

26. Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba?Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.

27. Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà,Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.

28. Ma ub͕u a kwenu ichem iru;Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?

29. Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi;E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.

30. Ọ̀ di ajọ omume di n'irem?Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?