isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 18 Bible Nso (IGBOB)

1. Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2. Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà?Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.

3. Gini mere aguworo ayi ka anumanu?Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.

4. Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya.Àgārapu uwa n'ihi gi?Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?

5. Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.

6. Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.

7. Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.

8. N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.

9. Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,Ọnyà gāma ya.

10. Ezobeworo ya udọ̀ n'ala,Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.

11. Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.

12. Agu ganāgu ume-ya,Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.

13. Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya,Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.

14. Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.

15. Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya:Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.

16. Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru,Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.

17. Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.

18. Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.

19. Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya,Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.

20. Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru,Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.