isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 36 Bible Nso (IGBOB)

1. Elaihu we nēkwu kwa, si,

2. Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi;N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.

3. M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem,Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.

4. N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu:Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.

5. Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:Ọ di ike n'ike nke obi.

6. Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.

7. Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume:Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-ezeKa Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.

8. Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala,Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;

9. O we nēgosi ha ọlu-ha,Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.

10. O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti,Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.

11. Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè,Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma,Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.

12. Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha,Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.

13. Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi:Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

14. Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata,Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.

15. Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya.Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.

16. Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕uBa n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya;Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.

17. Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.

18. N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe;Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.

19. Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà?Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?

20. Ekusila ume ike ibiaru abali,Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.

21. Lezie anya, echela ajọ ihe iru:N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.

22. Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

23. Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24. Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25. Madu nile elewo ya anya;Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.

26. Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27. N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28. Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.

29. Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-ojiNbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30. Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya;Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

31. N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe;Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.

32. Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua;We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.

33. Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya,Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.