isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 39 Bible Nso (IGBOB)

1. Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa?Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?

2. Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu?Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?

3. Ha nēruru ala, muputa umu-ha,Tuzuga ihe-nb͕u-ha.

4. Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia;Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.

5. Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya?Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?

6. Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya,Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.

7. Ọ nāchì ùzù obodo ọchì,Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.

8. Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya,Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.

9. Àtu gēkwe ibu orù-gi?Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?

10. Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi?Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?

11. Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?

12. Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?

13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,

15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

17. N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.

18. Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.

19. Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?

20. Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.

21. Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya:Ọ nāpu izute ihe-agha.

22. Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ;Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.

23. Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya,Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.

24. Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala;Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.

25. Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe!Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha,Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.

26. Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu,B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di?

27. Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu,Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?

28. N'elu nkume di elu ka o nēbi, nọ kwa ọnọdu-abali,N'elu ọnu nkume di elu na ebe ewusiri ike.

29. Site n'ebe ahu ka o nyoputaworo ihe-oriri;Anya-ya abua nēsi n'ebe di anya legide ya.