isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 11 Bible Nso (IGBOB)

1. Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2. Àgaghi-aza ọtutu okwu?Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume?

3. Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti;I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.

4. I we si, Nmutam di ọcha,M'di kwa ọcha n'anya-Gi.

5. Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu,Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;

6. Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe,Na ọ di okpukpu n'izube ihe.Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.

7. Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke?Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?

8. Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme?Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?

9. Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa,Di kwa obosara kari oké osimiri.

10. Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ,Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?

11. N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.

12. Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.

13. Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;

14. Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya,Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;

15. N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi;I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:

16. N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi,Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:

17. Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa;Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.

18. I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di;I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.

19. Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji;Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.