isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 33 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma otú ọ di, biko, Job, nuru okwum nile,Ṅa kwa nti okwum nile.

2. Biko, le, asaghewom ọnum,Irem ekwuwo n'okpo-ọnum.

3. Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim:Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha.

4. Mọ nke Chineke emewom,Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m'di ndu.

5. Ọ buru na i puru, zaghachim;Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi.

6. Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ:Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.

7. Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku,Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.

8. N'ezie i kwuwo na ntim,Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,

9. Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie;Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:

10. Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;

11. O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.

12. Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi:N'ihi na Chineke di uku kari madu.

13. Gini mere i ji so Ya se okwu,Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?

14. N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.

15. Na nrọ, bú ọhù nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;

16. Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,

17. Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;

18. Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.

19. Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:

20. Nri we nāsọ ndu-ya oyi,Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.

21. Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.

22. Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.

23. Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya,Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri,Igosi madu izi-ezi-ya;

24. Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si,Dọputa ya n'irida n'olùlù,Achọtawom ihe-nb͕aputa.

25. Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwataỌ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:

26. Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ;O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya:O we nyeghachi madu ezi omume-ya.

27. Ọ nābù abù n'iru madu, si,Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume,Ma ọ baghm n'ihe:

28. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù,Ndum gēle kwa ìhè.

29. Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu,Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n'ebe madu nọ,

30. Ime ka nkpuru-obi-ya si n'olùlù lata,Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè.

31. Job, ṅa nti, gem nti:B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu.

32. Ọ buru na okwu adi n'ọnu-gi, zaghachim:Kwue, n'ihi na ọ dim utọ igu gi n'onye ezi omume.