isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 27 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2. Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém;Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;

3. (N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem,Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)

4. N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume,Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.

5. Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume:Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.

6. Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka:Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.

7. Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.

8. N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?

9. Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?

10. Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?

11. M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.

12. Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?

13. Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.

14. Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.

15. Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.

16. Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,Dozie uwe dika urọ;

17. O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.

18. O wuwo ulo-ya dika nla,Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.

19. O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.

20. Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.

21. Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.

22. Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya:N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.