isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2. Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe?É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.

3. Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume?Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?

4. Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba,We so gi ba n'ikpé?

5. Ìhe ọjọ gi abaghi uba?Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.

6. N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu,Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.

7. I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri,I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ.

8. Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.

9. I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu,Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.

10. N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,

11. Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,Na njubiga miri nēkpuchi gi.

12. Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!

13. I we si, Gini ka Chineke mara?Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?

14. Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.

15. Ì gēdebe uzọ ochie,Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?

16. Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi,Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:

17. Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi:Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?

18. Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe:Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

19. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:

20. Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.

21. Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo:Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.

22. Biko, nara iwu n'ọnu-Ya,Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.

23. Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo;I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.

24. Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá,Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;

25. Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi,Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.

26. N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ,I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.

27. I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi;I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.

28. I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike;Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.

29. Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di;Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.